Song of Solomon 4

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

1Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya,
e, ị mara mma!
Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru.
Agịrị isi gị dị ka igwe ewu
Igwe ewu ndị a dị ojii.

nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead.
2Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ,
nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.
Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,
ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha.
3Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie.
Ọnụ gị dị mma ile anya.
Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị
dị ka pomegranet
Pomegranet na-acha uhie uhie.
e kere abụọ.
4Olu gị dị ka ụlọ elu Devid,
nke e wuziri nke ọma.
E konyere puku ọta na ya,
ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha. d
5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ,
nke otu nne mụrụ nʼotu oge,
ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.
6Tutu chi ụtụtụ abọọ,
tutu onyinyo agbalaga,
aga m aga nʼugwu ụda máá
na nʼugwu insensi.
7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya,
ọ dịkwaghị ntụpọ e ọbụla dị gị nʼahụ.

8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ.
Si na Lebanọn bịa soro m;
rịdata site nʼugwu Amana,
nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon,
site nʼọgba ọdụm
nʼugwu niile ebe agụ bi.
9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m;
i riela m obi,
i werela ile anya gị
na ihe olu i yi rie obi m.
10Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.
Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya,
isisi ụtọ nke mmanụ otite gị
na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla.
11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m,
mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị,
isisi ụtọ nke uwe gị
na-esi ka Lebanọn
12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ.
Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.
I ji debe olulu mmiri ọcha, ka ọ ghara ịgwọtọ, a na-emere ya okwuchi. Ma ọ bụrụ isi iyi, a na-akpa ihe mgbochi ka ndị mmadụ ghara iru nʼebe elu elu ya mgbe ha na-ekute mmiri.

13Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet
nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa,
nke nwere henna na naad,
14naad na safron,
kalamus na sinamọn,
na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
na ụda máá, na aloos
na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ.
15I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige,
olulu mmiri dị ndụ
nke si na Lebanọn asọdata.
Mgbe mkpụrụ mmiri nke kpuchiri ugwu Lebanọn na-agbaze, mmiri ya na-asọdata sọbanye nʼime ọtụtụ isi iyi, mee ka isi iyi ndị ahụ ghara ịta ata.

Onye a hụrụ nʼanya

16Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu;
Ọ bụ ifufe na-esite na mpaghara ugwu, nke na-efe nwayọọ na-eme ka mkpụrụ dị ọhụrụ, maa mma. Ma nke na-esite na ndịda, na-ebute okpomọkụ na-eme ka mkpụrụ ndị a chaa nke ọma. Ikuku abụọ ndị a bụ ihe na-ekusasi ezi isisi nke okoko ahịhịa dị nʼubi a gbara ogige.

bịakwa gị ifufe si na ndịda,
fekwasị ubi m a gbara ogige,
ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile,
ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige,
ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.
Copyright information for IboBIU